Publicidade

Sofonias 2

E kpere Juda na Jerusalem ikpe ha na mba niile
Oku akpọrọ Juda ka ọ chegharịa

1 Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu,

unu ndị mba ihe ihere dịrị.

2 Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ,

a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu,

tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị

abịakwasị gị,

tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị

abịakwasị gị.

3 Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ,

unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu.

Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi,

ma eleghị anya, a ga-echebe unu

nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.

Ahụhụ dịrị Filistia

4 Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza,

obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu.

Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd;

a ga-ehopukwa Ekrọn.

5 Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri,

unu bụ ndị Keret;

okwu Onyenwe anyị na-emegide unu,

Kenan, ala ndị Filistia.

Ọ sịrị, "Aga m ala gị nʼiyi,

ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị."

6 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ,

ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ

na ọgba igwe ewu na atụrụ.

7 Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri

ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda,

ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa.

Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu,

dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi.

Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha,

mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.

Ahụhụ dịrị Moab na Amọn

8 "Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab,

na ịkwa emo niile nke ndị Amọn,

nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m

na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.

9 Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,"

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

bụ Chineke Izrel, kwubiri ya,

"aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm,

mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra.

Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara,

na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.

Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha,

ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha."

10 Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha,

na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide

ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

11 Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ,

mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi.

Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya,

onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.

Ahụhụ dịrị Kush

12 "Unu ndị Itiopia,

a ghaghị iji mma agha gbuo unu."

Ahụhụ dịrị Asịrịa

13 Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu,

laa Asịrịa nʼiyi.

Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu,

ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.

14 Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ,

ha na ihe e kere eke dị iche iche.

Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo

ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ.

Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku,

mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile,

ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.

15 Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri,

nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla;

nke na-asị onwe ya,

"Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m."

Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu;

lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi.

Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ,

ma fufekwaa isi ya.

Veja também

Publicidade
Sofonias
Ver todos os capítulos de Sofonias
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-