Publicidade

Sofonias 1

1 Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda.

Ikpe ọmụma dịrị ụwa niile nʼụbọchị nke Onyenwe anyị

2 "Aga m azachapụ ihe niile

site nʼelu ụwa,"

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

3 "Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ.

Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe,

zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri,

na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ."

"Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niile

site nʼelu ụwa,"

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Ahụhụ dịrị Juda

4 "Aga m esetipụ aka m megide Juda,

megidekwa ndị niile bi na Jerusalem.

Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a,

na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,

5 bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha

na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando,

ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi,

ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,

6 na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị,

na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya."

7 Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị

nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso.

Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja;

o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.

8 "Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ,

aga m ata ndịisi niile

na ụmụ eze niile,

na ndị niile na-eyi uwe

e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.

9 Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ

bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata,

ndị ji ihe ike na aghụghọ

na-emejupụta ụlọ arụsị ha.

10 "Nʼụbọchị ahụ,"

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,

"olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa,

mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ,

na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.

11 Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị;

nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile.

Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.

12 Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem.

Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ,

bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ,

ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị,

maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’

13 Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike,

a ga-akwatukwa ụlọ ha niile.

Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ,

ma ha agaghị ebi nʼime ha;

ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị,

ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha."

Ụbọchị ukwu nke Onyenwe anyị

14 Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso,

ọ na-abịakwa ọsịịsọ.

Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu.

A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.

15 Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma,

ụbọchị ahụhụ na mkpagbu,

ụbọchị nsogbu na mbibi,

ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ,

ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,

16 ụbọchị opi ike na iti mkpu agha

imegide obodo niile e wusiri ike,

na imegide akụkụ ụlọ elu niile.

17 "Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ,

mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì,

nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị.

A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu,

tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.

18 Ọlaọcha na ọlaedo ha

agaghị azọpụta ha

nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ."

A ga-erechapụ ụwa niile

site nʼọkụ ekworo ya,

nʼihi na ọ bụ na mberede

ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.

Veja também

Publicidade
Sofonias
Ver todos os capítulos de Sofonias
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-