Bom ânimo
Tende bom ânimo! Jesus repetiu estas palavras aos seus discípulos em meio às tempestades. No mundo tereis aflições, mas Ele já venceu o mundo — e nos dá coragem para enfrentar tudo.
"Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa."
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga."
Joshua sịrị ha, "Unu atụla egwu, maọbụ daa mba. Dịnụ ike, nweekwanụ ume, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị ga-eme ndị iro unu niile bụ ndị na-ebuso unu agha."
Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,
unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.
Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m;
i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.
Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, "Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu."
Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha.
Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, "Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu."
Ọ gwara ya sị, "Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo."
Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị.
Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel.Onyenwe anyị
"Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike.
Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu,
ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m.
Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.
Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.
Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;
ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe. Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, ọ bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu.
Ndị Izrel niile zara sị ya, "O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ! Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.