Pular para o conteúdo
Publicidade

Jona 4

Iwe Jona nʼihi ọmịiko Onyenwe anyị

1 Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ. 2 Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, "O, Onyenwe anyị, nke a bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị. 3 Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ."

4 Ma Onyenwe anyị sịrị, "O ziri ezi na ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?"

5 Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka hụ ihe gaje ime obodo ahụ. 6 Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara,4:6 Emeghị ka anyị amata ụdị osisi ọ bụ ma ụfọdụ akwụkwọ na-ede osisi ogiri ugba. nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ. 7 Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka kpọnwụọ. 8 O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, "ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ."

9 Ma Chineke sịrị Jona, "bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?"

sịrị, "E, ana m ewe oke iwe, bụladị na m chọrọ ịnwụ."

10 Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, "I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị. 11 Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?"

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também

Jonas
Ver todos os capítulos de Jonas