Publicidade

Jonas 2

1 Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. 2 Ọ sịrị,

"Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,

ọ zakwara m.

Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,

ị nụkwara olu akwa m.

3 Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,

nʼetiti oke osimiri.

Osimiri dịkwa m gburugburu,

ebili mmiri gị na mmali mmiri gị

gabigakwara m nʼisi.

4 Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị

chụpụ m;

ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ

nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’

5 Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,

ogbu mmiri na-erikpu m.

Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.

6 Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,

ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.

Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,

Onyenwe anyị, bụ Chineke m.

7 "Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,

e chetara m gị Onyenwe anyị,

ma ekpere m bịakwutere gị,

nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.

8 "Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,

na-agbakụta ebere Chineke azụ.

9 Ma ọ bụ olu abụ ekele

ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.

Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.

Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ "

10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.

Veja também

Publicidade
Jonas
Ver todos os capítulos de Jonas
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-