Publicidade

Bom dia

Por Bíblia Online

Cada manhã é presente de Deus. As misericórdias do Senhor se renovam cada dia. A Bíblia convida a começar o dia com louvor, oração e gratidão ao Criador.

Manhã com Deus

De manhã te apresentarei a minha oração. Pela manhã ouvirás a minha voz — eu te busco ao despertar.

Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ga-anụ olu m;

aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa.

Aga m elekwa anya ọsịsa gị.

Ma Onyenwe anyị m, bụ gị ka m na-akpọku.

Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe nọ.

Teta nʼụra mkpụrụobi m!

Teta, ụbọ akwara na une!

Aga m akpọte chi ọbụbọ.

Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,

nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;

bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,

ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.

Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,

nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;

bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,

ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.

O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto;

gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,

Chineke m, onye m na-adabere.

Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ,

nʼihi na bụ gị ka m tụkwasịrị obi.

Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso,

nʼihi na bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.

Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume;

mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.

Misericórdias renovadas

As misericórdias do Senhor se renovam cada manhã. Este é o dia que o Senhor fez — alegremo-nos e nos regozijemos nele.

bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,

nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.

Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;

ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.

Mkpụrụobi m na-ekwu, "Onyenwe anyị bụ oke m,

nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya."

bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,

nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.

Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;

ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.

Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere,

ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya,

toonu aha nsọ ya.

Iwe ya adịghị adịgide tee anya,

ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!

Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,

ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

Iwe ya adịghị adịgide tee anya,

ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!

Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,

ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile,

nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada,

ka na-akpọlite abụ ọṅụ.

Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ,

ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.

Louvor matinal

Saciai-nos de manhã com a tua benignidade. Todo dia te louvarei e celebrarei o teu nome para sempre.

Ịdị mma nke Chineke

Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze;

aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

Ụbọchị niile ka m ga-eto gị

jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

Ekele maka ịdị mma Chineke

bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị,

na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,

ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ,

na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,

Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,

bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;

kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.

Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,

kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.

O, otu m si hụ iwu gị nʼanya!

Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile.

Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,

nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,

ekpere nye Chineke nke ndụ m.

Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,

nʼihi na bụ gị ka anyị na-ele anya.

Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile,

bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya

ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.

Ụtụtụ niile ka na-akpọte mmụọ m,

meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.

Graça para o novo dia

O Senhor te abençoe e te guarde. Cada novo dia é oportunidade de viver sob a graça do Deus que nos ama.

" ‘ "Onyenwe anyị gọzie unu

ma chebe unu,

Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu,

ma meere unu amara,

Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ,

nyekwa unu udo." 

Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,

esepụkwala aka nʼanyasị,

nʼihi na maghị nke ga-eto,

maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,

ha niile nwere ike too nke ọma.

Tupu chi abọzie,

nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri,

ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.

Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ghara ịghọ onye ụkpa.

Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.

Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. bụrụ ụbọchị nke mbụ.

Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.

nwụrụ nʼihi anyị ka bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-04_23-13-58-