Publicidade

O que é bom

Por Bíblia Online

O que é bom vem de Deus. A Bíblia celebra a bondade divina e nos convida a discernir, praticar e desfrutar tudo o que é bom — porque toda boa dádiva vem do Pai das luzes.

Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. bụrụ ụbọchị nke isii.

Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;

bụ ya mere na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.

Ma nye mụ onwe m, dị mma ịnọ Chineke nso.

Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m.

Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.

Ekele maka ịdị mma Chineke

bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị,

na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,

ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ,

na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,

jiri ihe iti egwu ụbọ akwara

na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.

Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.

Ngọzị nke ibi nʼotu

Lee ka o si bụrụ ihe dị mma

na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!

Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;

ya mere, unu ahapụkwala iwu m.

Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,

okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.

Okwu nke iri abụọ na isii

Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na dị mma.

Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.

Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ.

bụrụ na i chọta ya

i nwere olileanya nke ga-adịgide.

Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma.

na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.

Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,

e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.

bụ ihe dị mma iji nwayọọ

chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.

Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.

Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị,

bụ na bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,

na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?

Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma.

Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

Ekwela ka ihe ọma gị bụrụ nke a ga-akpọ ajọọ ihe.

Iwu banyere Ofufe na Ekpere

Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile, kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka chọrọ. Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.

Ihe niile Chineke kere dị mma, dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma bụrụ na e jiri ekele nara ya, nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.

Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.

"Nnu dị mma, ma bụrụ na dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ga-esi mee ka tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo."

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-