Pular para o conteúdo
Publicidade

Job 17

1 Mmụọ m tiwara etiwa,

ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,

ili na-echere ịnabata m.

2 Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;

anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.

3 "Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.

Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?

4 I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;

ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.

5 bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,

anya ụmụ ya ga-ada mba.

6 "Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,

meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.

7 Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;

ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.

8 Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;

ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.

9 Ma otu ọbụla dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,

ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.

10 "Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!

Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.

11 Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.

Ma ọchịchọ nke obi m

12 na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;

nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.

13 bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,

bụrụ na m agbasaa17:13 Maọbụ, atụsaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,

14 a sikwa na m asị ire ure, Nna m ka bụ,

maọbụ sị ikpuru Nne mmaọbụ Nwanne m nwanyị,

15 ebeekwa ka olileanya m dị?

Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?

16 Olileanya m ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?

Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?"

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também