Publicidade

Jó 9

Okwu Job

1 Job zara sị:

2 "Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.

Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?

3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,

ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?

4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,

onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?

5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,

na-akwatụ ha nʼiwe ya.

6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,

mee ka ogidi ya maa jijiji.

7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;

ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.

8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe,

ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.

9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion

na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.

10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,

ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.

11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,

mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.

12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?

Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’

13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,

ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.

14 "Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,

maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?

15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;

kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.

16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,

ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.

17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,

meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.

18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi

kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.

19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!

Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.

20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;

ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.

21 "Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị

ejighị m onwe m kpọrọ ihe;

nʼezie ana m eleda ndụ m anya.

22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,

‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’

23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,

ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.

24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,

ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya.

Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?

25 "Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;

ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.

26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,

dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.

27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,

aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’

28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu

nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.

29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara,

nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?

30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m

werekwa soda saa aka m abụọ,

31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtị

nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.

32 "Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,

ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.

33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,

onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,

34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,

ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.

35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;

ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-