Publicidade

Jó 23

Okwu Job

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:

2 "Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu;

aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.

3 A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya;

a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!

4 Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya

were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.

5 Aga m achọpụta ihe o ga-aza m

ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.

6 Ọ ga-eji ike dị egwu megide m?

Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.

7 Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.

Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.

8 "Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;

ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.

9 Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,

mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.

10 Ma ọ maara ụzọ m na-aga,

mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,

11 ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;

ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.

12 Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m;

a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.

13 "Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?

Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.

14 Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,

ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.

15 Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;

mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.

16 Chineke emeela ka obi m daa mba;

Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.

17 Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,

bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-