Publicidade

Jó 6

Okwu Job

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:

2 "A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m

ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!

3 Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri,

nke mere okwu m ji ada ike ike.

4 Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m;

mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha;

ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.

5 Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata,

ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?

6 A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu,

ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?

7 A jụrụ m ịmetụ ya aka,

nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.

8 "O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,

na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.

9 Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m

ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.

10 Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,

wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide,

na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.

11 "Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?

Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?

12 Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?

Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?

13 Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka,

ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?

14 "Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ

na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.

15 Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha,

dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,

16 nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi,

nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.

17 Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị,

nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.

18 Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha.

Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.

19 Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri,

otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.

20 Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi,

ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.

21 Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru,

unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.

22 O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m,

sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,

23 gbapụtanụ m nʼaka ndị iro,

maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?

24 "Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ,

gosi m ebe m si mejọọ.

25 Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi!

Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?

26 Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m?

Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?

27 Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna,

ma refukwaa enyi unu.

28 "Lezie m anya nke ọma,

ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?

29 Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi,

tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.

30 Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta?

Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-