Publicidade

Jó 13

1 "Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,

ntị m anụla ma ghọtakwa ha.

2 Mụ onwe m makwa ihe unu maara;

abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.

3 Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,

ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.

4 Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;

unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.

5 Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,

nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.

6 Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;

geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.

7 Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?

Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?

8 Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?

Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?

9 Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu?

Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?

10 Ọ ghaghị ịbara unu mba

ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.

11 Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji?

Egwu ya ọ dịghị atụ unu?

12 Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ;

okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.

13 "Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu;

ihe ọ pụtara ya pụta.

14 Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu,

werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?

15 A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m.

Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.

16 Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta

maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.

17 Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m.

Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.

18 Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro,

amatala m na ikpe agaghị ama m.

19 Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo?

Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.

20 "Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke,

mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.

21 Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ.

Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.

22 Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị.

Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.

23 Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?

Gosi m ajọ omume m na mmehie m.

24 Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?

Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?

25 Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?

Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?

26 Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,

na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.

27 Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;

na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile

site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.

28 "Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere,

na dịka akwa nke nla riri.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-