Publicidade

Jó 27

Okwu ikpeazụ Job nye ndị enyi ya

1 Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:

2 "Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,

Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.

3 Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,

mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,

4 egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,

ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.

5 Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;

ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.

6 Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;

o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.

7 "Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,

ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.

8 Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,

mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?

9 Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya

mgbe nsogbu dakwasịrị ya?

10 Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?

Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?

11 "Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;

agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.

12 Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,

gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?

13 "Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,

nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.

14 Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;

ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.

15 Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;

ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.

16 Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,

ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,

17 ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,

ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.

18 Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,

dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.

19 Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;

mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.

20 Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;

oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.

21 Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;

ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.

22 Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere

mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.

23 Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,

were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-