Publicidade

Jó 4

Okwu Elifaz

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:

2 "Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?

Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?

3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,

na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.

4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,

ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.

5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;

nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.

6 Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,

izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?

7 "Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?

Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?

8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka

na-aghọta ya dịka ihe ubi.

9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.

Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.

10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,

ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.

11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,

ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.

12 "E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,

ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.

13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,

mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,

14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,

meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.

15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.

Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.

16 Ọ kwụsịrị;

ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ.

Onyinyo guzooro nʼanya m,

anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:

17 ‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?

Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?

18 Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,

ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,

19 ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,

bụ ndị ntọala ha dị nʼaja,

ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.

20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:

ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.

21 Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,

mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-