Pular para o conteúdo
Publicidade

Job 33

1 "Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;

ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.

2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;

okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.

3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;

egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.

4 bụ Mmụọ nke Chineke mere m,

nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.

5 Zaghachi m ma bụrụ na i nwere ike;

jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.

6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;

mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.

7 Egwu m ekwesighị ime ka tụọ oke ụjọ,

ma bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.

8 "Ma kwuola ya na ntị m,

anụrụ m okwu ndị ahụ niile,

9 Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;

adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.

10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;

na-ahụta m dịka onye iro ya.

11 na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;

na-enyochakwa ụzọ m niile.

12 "Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,

nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.

13 Gịnị mere i ji na-ekpesara ya

na dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?

14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,

bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.

15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,

mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra,

mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.

16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntị

ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;

17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,

ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,

18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,

chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.

19 "Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,

ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.

20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,

ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.

21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,

ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.

22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,

ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.

23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,

dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,

onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,

24 na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,

Napụta ya, ekwela ka gbadaa nʼime olulu ili;

achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.

25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,

ka a eweghachi ike ya dịka dị nʼụbọchị okorobịa ya.

26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,

ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,

na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.

27 Mgbe ahụ, na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:

Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka bụrụ ajọ omume,

ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;

28 gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,

ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.

29 "Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ

ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.

30 Ka dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,

ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.

31 "Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;

dere jii ka m kwuo okwu.

32 bụrụ na i nwere ihe chọrọ ikwu, zaghachi m;

kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.

33 Ma bụghị otu a, gee m ntị;

dere jii, ka m zi gị amamihe."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também