Pular para o conteúdo
Publicidade

Job 37

1 "Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,

na-amali elu site nʼọnọdụ ya.

2 Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,

na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.

3 na-atọpụ amụma ya ka na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,

na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.

4 Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;

ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,

mgbe olu ahụ dara dakwasị,

naghị egbochi amụma igbu egbu.

5 Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;

na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.

6 Nʼihi na bụ ya na-agwa snoo okwu sị: Daa nʼelu ala,

na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, Zoo nnukwu mmiri ozuzo.37:6 Ghọọ oke mmiri ozuzo

7 Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya;

na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.

8 Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe;

ha na-anọgide nʼebe obibi ha.

9 Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa,

oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.

10 Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri,

ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.

11 na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri;

na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.

12 Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu

imezu ihe ọbụla chọrọ ka ha mee

nʼelu ụwa niile.

13 na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,

na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.

14 "Job, gee ntị.

Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.

15 maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii

na-eme ka amụma gbuo?

16 maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,

nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?

17 Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ

mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,

18 pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe

nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?

19 "Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;

ebe bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.

20 A ga-agwa ya na m nwere okwu?

dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?

21 Ugbu a, dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya

ka na-achake na mbara igwe,

mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.

22 Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;37:22 Maọbụ, nʼugwu ka ọ si na-abịa ka ebube ọlaedo

Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.

23 Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,

nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, naghị emegbu mmadụ.

24 Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya,

bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?"37:24 Ma ọ dịghị agụnye ndị niile na-eche na ha maara ihe.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também