Publicidade

Jó 8

Okwu Bildad

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:

2 "Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a?

Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.

3 Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?

Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?

4 Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya,

o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.

5 Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike,

rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,

6 ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi,

ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị

weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.

7 Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala,

ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.

8 "Jụọ ọgbọ ndị gara aga

ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.

9 Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara.

Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.

10 Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?

Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?

11 Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?

Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?

12 Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,

ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.

13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,

otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.

14 Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;

ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.

15 Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;

ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.

16 Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,

nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.

17 Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,

ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.

18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,

ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’

19 Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,

site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.

20 "Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,

maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.

21 Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.

Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.

22 Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe,

ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-