Publicidade

Jó 32

Okwu Elihu

1 Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume. 2 Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke. 3 Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe. 4 Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ. 5 Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.

6 Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:

"Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,

ma unu bụ ndị okenye;

ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,

hapụ ịgwa unu ihe m maara.

7 Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;

ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’

8 Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,

nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.

9 Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,

ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.

10 "Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;

mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.

11 Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,

egere m ntị na ntụgharị uche unu,

oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.

12 Egere m nnọọ unu ntị,

ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;

ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.

13 Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;

ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’

14 Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m,

ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.

15 "Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu;

ike okwu agwụla ha.

16 M ga-echere, ugbu a ha deere duu,

ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?

17 Mụ onwe m ga-ekwu uche m;

ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,

18 nʼihi na okwu juru m ọnụ,

ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.

19 Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,

dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.

20 Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;

aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.

21 Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide

maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.

22 Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma,

Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-