Publicidade

Jó 18

Okwu Bildad

1 Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:

2 "Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu?

Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.

3 Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa,

gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?

4 Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị,

a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị?

Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?

5 "A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu;

ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,

6 ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị,

oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.

7 Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya;

atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.

8 Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya;

ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.

9 Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya,

ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.

10 E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala,

ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.

11 Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile,

na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.

12 Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike;

mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.

13 Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya;

ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.

14 Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya

duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.

15 Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya;

a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.

16 Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala,

alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.

17 A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ,

o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.

18 A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị,

otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.

19 O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya,

ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.

20 Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya;

oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.

21 Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị,

ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-