Publicidade

Jó 29

Ngọpụ ikpeazụ Job

1 Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:

2 "Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,

dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,

3 mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi

ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.

4 Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,

mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,

5 mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m

na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,

6 mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,

mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.

7 "Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo

were ọnọdụ m nʼama.

8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,

ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;

9 ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu

ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;

10 olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,

ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.

11 Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,

ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.

12 Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,

napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.

13 Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;

emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.

14 Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,

ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.

15 Abụ m anya nye onye ìsì,

bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.

16 Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;

bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.

17 Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,

si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.

18 "Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,

na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.

19 Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,

na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.

20 Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,

ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’

21 "Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,

ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.

22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.

Okwu m na-ada juu na ntị ha.

23 Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,

na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.

24 Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;

ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.

25 Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;

ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya;

na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-