Pular para o conteúdo
Publicidade

Job 22

Okwu Elifaz

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:

2 "Mmadụ pụrụ ịbara Chineke uru?

bụladị onye nwere uche pụrụ ịbara Chineke uru?

3 O nwere ọṅụ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na bụ onye ezi omume?

Uru gịnị ka ga-enweta ma bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?

4 "Chineke na-abara gị mba na-ebo gị ebubo

nʼihi na na-atụ egwu ya?

5 bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu?

Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ?

6 naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu;

yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.

7 I nyeghị ndị ike gwuru mmiri,

i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.

8 bụ eziokwu na bụ nwoke dị ike na onye nwere ala,

bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,

9 na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha,

na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.

10 bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu,

bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.

11 bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ghara ịhụ ụzọ,

meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.

12 "bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe?

Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.

13 Kama na-asị, Gịnị ka Chineke maara?

na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?

14 Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na naghị ahụ anyị

mgbe na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.

15 ga-agbaso ụzọ ochie

nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?

16 E bupụrụ ha tupu oge ha eruo.

Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ

17 Ha sịrị Chineke, Hapụ anyị aka!

Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?

18 Ma bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha,

ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.

19 Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa;

ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:

20 Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị,

ọkụ erepịala akụnụba ha.

21 "Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo,

nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.

22 Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ,

doo okwu ya niile nʼobi gị.

23 bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị;

bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,

24 tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja,

tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.

25 Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo,

bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma.

26 Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ,

ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.

27 ga-ekpe ekpere, ga-azakwa gị ekpere gị,

ga-emezukwa nkwa i kwere.

28 Ihe i kpebiri ga-emezukwa,

ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.

29 Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, bụrụkwa na sị, Bulienụ ha elu,

mgbe ahụ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.

30 ga-azọpụta bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha,

bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também