Publicidade

Jó 10

1 "Ike ịdị ndụ agwụla m.

Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi,

kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.

2 Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,

kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.

3 Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,

si otu a leda ọrụ aka gị anya,

mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?

4 Ị nwere anya nke anụ ahụ?

Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?

5 Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,

ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?

6 Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m

ma nyochaa mmehie m?

7 Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,

na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.

8 "Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.

Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?

9 Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.

Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?

10 Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi

mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?

11 Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,

werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?

12 I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,

nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.

13 "Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,

amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.

14 Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,

ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.

15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!

A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu

nʼihi na ejupụtara m nʼihere,

bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.

16 Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ

ma werekwa ike gị dị egwu megide m.

17 I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,

mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;

ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.

18 "Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?

Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.

19 A sịkwarị na amụpụtaghị m

maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!

20 Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?

Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,

21 tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ

ebe m na-agaghị esi pụtakwa.

22 Nʼala nke oke ọchịchịrị,

ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị,

ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-