Publicidade

Jó 12

Okwu Job

1 Mgbe ahụ, Job zara:

2 "Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,

unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.

3 Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;

abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ.

Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?

4 "Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,

nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za,

onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!

5 Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya

dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.

6 Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;

ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo,

bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.

7 "Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,

maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.

8 Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị,

maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.

9 Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị

na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?

10 Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị,

ya na ndụ ụmụ mmadụ

11 Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu,

otu ire si anwale ihe oriri?

12 Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?

Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?

13 "Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,

ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.

14 Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;

mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.

15 Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.

Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.

16 Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;

ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.

17 Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,

ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.

18 Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,

ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.

19 Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha,

kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.

20 Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi,

wepụkwa nghọta nke ndị okenye.

21 Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị,

napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.

22 Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị

meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.

23 Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi;

Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.

24 Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha,

zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.

25 Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè.

Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-