Publicidade

Jó 28

Nwa mgbe nta: Ebe a na-achọta amamihe

1 Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị;

ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.

2 E si nʼime ala ewepụta igwe,

ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.

3 Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ;

ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya,

na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.

4 Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi,

nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru,

nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.

5 Ala ahụ e si na ya enweta nri,

abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.

6 Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya;

aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.

7 Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo;

anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.

8 Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya,

ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.

9 Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ

mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.

10 Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ,

anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.

11 Ha na-achọpụta isi mmiri niile

ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.

12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?

Olee kwa ebe nghọta bi?

13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,

agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.

14 Ogbu mmiri na-asị, "Ọ dịghị nʼime m,"

osimiri na-asị, "Ọ dịghị nʼaka m."

15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,

apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.

16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,

a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,

17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,

maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.

18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị;

ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.

19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;

a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.

20 Olee ebe amamihe si abịa?

Olee ebe nghọta bi?

21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,

e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.

22 Mbibi na ọnwụ na-asị;

"Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị."

23 Chineke ghọtara ụzọ ya,

naanị ya makwara ebe obibi ya dị.

24 Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa,

na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.

25 Mgbe o hiwere ike nke ikuku,

tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,

26 mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu

meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,

27 mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya,

meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.

28 Ọ sịrị mmadụ,

"Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe;

ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-