Publicidade

Jó 20

Okwu Zofa

1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2 "Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi

nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.

3 Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,

ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.

4 "Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,

ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.

5 Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,

ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.

6 Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,

na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;

7 ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;

ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’

8 Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,

dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.

9 Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,

ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.

10 Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;

aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.

11 Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa

ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.

12 "Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,

na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;

13 ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,

ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,

14 ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,

ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.

15 Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;

Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.

16 Ọ ga-amịcha elo agwọ,

eze agwọ ajụala ga-egbu ya.

17 Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,

bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.

18 Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.

Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.

19 Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,

ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.

20 "Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;

ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.

21 Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,

ọganihu ya agaghị adịgide.

22 Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,

oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.

23 Mgbe o rijuru afọ

ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,

iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.

24 Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,

àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.

25 Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,

site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.

Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.

26 Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,

ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya

ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.

27 Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya

ụwa niile ga-ebili megide ya.

28 Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;

oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.

29 Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,

ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-