Pular para o conteúdo
Publicidade

Job 20

Okwu Zofa

1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2 "Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi

nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.

3 Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,

ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.

4 "Nʼezie, maara otu dị site na mgbe ochie,

ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.

5 Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,

ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.

6 Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,

na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;

7 ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;

ndị maara ya ga-ajụ, Olee ebe nọ?

8 ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,

dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.

9 Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,

ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.

10 Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;

aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.

11 Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa

ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.

12 "bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,

na na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;

13 bụ ezie na pụghị nʼịhapụ ya,

na-edebe ya nʼọnụ ya,

14 ma nri na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,

ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.

15 ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;

Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.

16 ga-amịcha elo agwọ,

eze agwọ ajụala ga-egbu ya.

17 gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,

bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.

18 Ihe rụpụtara ka ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.

Uru zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.

19 Nʼihi na kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,

nakọtakwara ụlọ nke na-ewughị.

20 "Nʼezie, gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;

gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.

21 dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,

ọganihu ya agaghị adịgide.

22 Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,

oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.

23 Mgbe o rijuru afọ

ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,

iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.

24 bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,

àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.

25 Nʼazụ ya ka na-esi mịpụta ya,

site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.

Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.

26 Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,

ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya

ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.

27 Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya

ụwa niile ga-ebili megide ya.

28 Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;

oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.

29 Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,

ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também