Publicidade

Jó 35

1 Mgbe ahụ, Elihu sịrị:

2 "Ị na-eche na nke a ziri ezi?

Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’

3 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m,

gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’

4 "Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị,

zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.

5 Lelie anya na eluigwe ma hụkwa.

Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.

6 Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya?

Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?

7 Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya,

maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?

8 Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị,

ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.

9 "Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu,

ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.

10 Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ,

onye na-enye abụ nʼime abalị,

11 onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa,

onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’

12 Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa,

nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.

13 Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha;

Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.

14 Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị

mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya,

na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya

na ị ga-anọkwa na-eche ya!

15 Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ,

nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.

16 Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe;

ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-