Publicidade

Jó 26

Okwu Job

1 Mgbe ahụ, Job zaghachiri:

2 "Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!

Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!

3 Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!

Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.

4 Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?

Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?

5 "Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,

ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.

6 Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;

mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya.

7 Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.

O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.

8 Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,

ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.

9 Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,

na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,

10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,

ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.

11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,

tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.

12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;

ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.

13 Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;

aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.

14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;

lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya!

Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?"

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-