Publicidade

Jó 39

1 "Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?

O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?

2 Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha.

Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?

3 Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha.

Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.

4 Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike.

Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.

5 "Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?

Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?

6 Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha,

ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.

7 Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,

ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.

8 Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,

ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.

9 "Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?

Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?

10 Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị?

Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?

11 Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne?

Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?

12 I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka

site nʼebe ịzọcha ọka gị?

13 "Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,

ma a pụghị iji nku ya tụnyere

nku na abụba nke ụgbala.

14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala

ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.

15 Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha

maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.

16 Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,

ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.

17 Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe

maọbụ kenye ya oke na inwe uche.

18 Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ,

ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.

19 "Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya,

ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?

20 Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube,

were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?

21 Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,

ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.

22 Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya;

ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.

23 Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,

ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.

24 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.

Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.

25 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’

Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha.

Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.

26 "Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu,

gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?

27 Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu

ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?

28 Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị;

ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.

29 O bụ site nʼebe ahụ

ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.

30 Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara,

nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-