Publicidade

Jó 5

1 "Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị?

Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru?

2 Oke iwe na-egbu onye nzuzu,

ekworo na-egbu onye na-enweghị uche.

3 Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ,

mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.

4 Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị,

a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha.

5 Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi;

ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu;

akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso.

6 Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta,

ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.

7 Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,

dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu.

8 "Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke;

ya ka m ga-akọsara ihe niile.

9 Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta,

ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.

10 Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo,

ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.

11 Ọ na-ebuli ndị dị ala elu,

na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.

12 Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ,

ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere.

13 Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile,

mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ.

14 Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie,

nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị;

15 Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ,

ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike.

16 Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya,

ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya.

17 "Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị;

ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile.

18 Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha;

Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa.

19 Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii,

mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa.

20 Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ;

chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.

21 Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.

Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.

22 Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi,

ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.

23 Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ,

gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo.

24 Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo;

ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu.

25 Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ,

matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala.

26 Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi,

dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru.

27 "Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu.

Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-