Publicidade

Jó 36

1 Elihu gara nʼihu sị:

2 "Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị

na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.

3 Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;

aga m enye Onye kere m ezi omume.

4 Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;

onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.

5 "Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;

ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.

6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,

kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.

7 Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ,

kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,

bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.

8 Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,

jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,

9 ọ na-agwa ha ihe ha mere,

na ha sitere na nganga ha mehie.

10 Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,

na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.

11 Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,

ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,

biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.

12 Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,

ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,

ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.

13 "Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.

Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.

14 Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,

nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.

15 Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;

na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.

16 "Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,

baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị,

baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.

17 Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;

ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.

18 Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;

ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.

19 Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị

ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?

20 Anọla na-echere ka abalị bịa,

mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.

21 Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,

bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.

22 "E buliela Chineke elu nʼike ya,

onye bụ onye ozizi dịka ya?

23 Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,

maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?

24 Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,

bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.

25 Mmadụ niile ahụzuola ya;

ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.

26 Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.

Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.

27 "Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,

nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.

28 Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya

mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.

29 Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,

ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?

30 Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya

na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.

31 Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile

na-enyejukwa ha nri afọ.

32 O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,

ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.

33 Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;

ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-