Publicidade

Jó 19

Okwu Job

1 Job zara sị:

2 "Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ?

Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m?

3 Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m,

ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha?

4 A sịkwarị na m bụ onye mmehie,

ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara.

5 Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m,

ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m,

6 mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m,

were ụgbụ ya tụọ m gburugburu.

7 "Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata;

ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị.

8 Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe;

o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m.

9 O yipụla m ugwu m,

wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.

10 Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara;

ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.

11 Iwe ya dị ọkụ megide m;

ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.

12 Ndị agha ya ji ike na-abịa;

ha ewuola mgbidi were nnọchibido m

ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m.

13 "O meela ka ụmụnne m

na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ.

14 Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m;

ndị ezi enyi m niile echefuola m.

15 Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ;

adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ.

16 Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m,

ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya.

17 Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide;

abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m.

18 Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo;

ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara.

19 Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ;

ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m

20 Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ;

ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.

21 "Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere,

nʼihi na aka Chineke na-emegide m.

22 Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m?

Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?

23 "Ọ gaara atọ m ụtọ

ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ,

24 na e ji mkpisi igwe dee ha,

maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi.

25 Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ,

amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.

26 Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m,

ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.

27 Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya,

mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ.

Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!

28 "Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya

nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’

29 unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha;

nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha,

mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-