Publicidade

Jó 30

1 "Ma ugbu a, ha na-akwa m emo

bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ,

bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ

ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.

2 Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,

ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?

3 Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,

ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ

na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.

4 Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,

mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.

5 A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,

a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.

6 A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.

Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.

7 Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,

na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.

8 Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha,

e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.

9 "Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo;

abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.

10 Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso;

ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.

11 Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,

o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.

12 Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.

Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,

ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.

13 Ha na-etiwasị ụzọ m,

ha kwadoro mmekpa ahụ m.

‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.

14 Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;

nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.

15 Oke egwu abịakwasịla m;

ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,

nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.

16 "Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;

ụbọchị ahụhụ ejidela m.

17 Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m,

ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.

18 Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe;

ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.

19 Ọ na-atụba m nʼime apịtị,

mee ka m ghọọ ntụ na aja.

20 "Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m;

anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.

21 Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere;

i ji aka gị dị ike megide m.

22 Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe,

ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.

23 Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ;

ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.

24 "Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala;

mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.

25 Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu;

ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?

26 Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara;

mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.

27 Obi m anaghị ezu ike nʼime m;

ụbọchị ahụhụ na-ezute m.

28 Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ.

Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.

29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa;

onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.

30 Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere;

anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.

31 Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ;

ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-