Publicidade

Jó 14

1 "Mmadụ nke nwanyị mụrụ

nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.

2 Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya,

dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.

3 Ị na-elegide onye dị otu a anya?

Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?

4 Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha?

Ọ dịghị onye ọ bụ.

5 Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ;

ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile,

kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.

6 Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya

ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.

7 "Ma olileanya dịịrị osisi;

nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa,

alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.

8 A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala,

maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,

9 mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya,

ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.

10 Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya;

ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.

11 Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata,

maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,

12 otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ;

tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya,

agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.

13 "A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ,

na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara.

A sị na ị ga-akanyere m oge

ma mesịa cheta m.

14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?

Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m,

aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.

15 Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị,

agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.

16 Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ,

ma ị gaghị agụkọ mmehie m.

17 A ga-ekechi njehie m nʼakpa,

ị ga-ekpuchi mmehie m.

18 "Ma dịka ugwu si erichasi daa,

na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,

19 dịka mmiri si akwọchasị nkume,

na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala,

otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.

20 Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga;

ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.

21 Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a;

ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.

22 Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama

ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-