Publicidade

Jó 11

Okwu Zofa

1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2 "Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?

A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?

3 Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?

Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?

4 Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,

adịkwa m ọcha nʼanya gị.’

5 Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,

na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.

6 Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,

nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ.

Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.

7 "I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke?

I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?

8 Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime?

Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?

9 Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa,

dị obosara karịa oke osimiri.

10 "Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ,

kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?

11 Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie,

mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?

12 Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe

naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.

13 "Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya,

setịpụ aka gị abụọ nye ya,

14 ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka,

ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị

15 mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị,

ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.

16 Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị,

na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.

17 Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie,

ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.

18 Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;

ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.

19 Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,

ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.

20 Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada,

ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ;

olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-