Buscar a Deus
Buscar a Deus é o chamado mais urgente da Bíblia. Buscai primeiro o Reino de Deus. Os que buscam de todo coração encontram — porque Ele se deixa encontrar pelos que o procuram.
Buscai ao Senhor
Buscai ao Senhor enquanto se pode achar. Buscai e achareis. O Senhor recompensa os que o buscam com diligência.
Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.
Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.
Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.
Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.
"Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.
Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.
Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,
asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’
Ọ na-enye ndị na-ada mba ike,
na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha.
E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.
"Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.
ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.
Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, "Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya.
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded. Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, "Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya. Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka. Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara. Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha. Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu."
Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa. Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha. Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe. Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye. Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi. Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn. Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.
De todo o coração
Buscar-me-eis e me achareis quando me buscardes de todo o coração. O Senhor é bom para os que o buscam.
Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
"Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?"
Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya.
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya
ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya
ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.
Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.
Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba;
gbaa m ume dịka okwu gị si dị.
Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe
nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Obi m na-ekwu banyere gị, "Chọọ ihu ya!"
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
O Chineke, ị bụ Chineke m,
e ji m obi m niile na-achọ gị;
akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,
anụ ahụ m na-achọsi gị ike,
nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba
ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
Buscar e encontrar
Pedi e dar-se-vos-á. O Senhor está perto de todos os que o invocam em verdade. Quem o busca não ficará insatisfeito.
"Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
"Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
"Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu."
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m,
napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile.
Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha,
ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.
Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta
onye nke na-achọ Chineke.
O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,
ị makwaara m nke ọma
Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;
site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị,
natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya,
bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela
Força na busca
Buscai o bem e não o mal. Sede fortalecidos no Senhor. A busca por Deus traz renovação e plenitude de vida.
Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel,
"Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.
Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel,
"Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.
Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ;
ka unu dịrị ndụ.
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu,
dịka unu si kwuo.
Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu;
Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu.
Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,
Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.
Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.
Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ."
Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile."
Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere.
Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, "O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ."
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị
karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị
karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.
Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ.
Ọ bụrụ na i chọta ya
i nwere olileanya nke ga-adịgide.