Publicidade

Obadias 1

Ọhụ Ọbadaya

1 Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ.

Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere Edọm.

Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,

e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,

"Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya."

2 "Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche;

ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu.

3 Nganga nke obi gị eduhiela gị,

gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu,

onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu.

Gị onye na-ekwu nʼime obi ya,

‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’

4 A sịkwarị na i felie elu dịka ugo,

ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando,

aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

5 "Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị,

e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị,

lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị!

Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru?

Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,

ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?

6 Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya,

lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!

7 Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị,

ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala;

ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu,

ma ị gaghị achọpụta ya.

8 "Nʼụbọchị ahụ," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,

"ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi,

bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ?

9 Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri.

Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile,

ka a ga-egbuda nʼagha.

10 Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike.

Ihere ga-ekpuchi gị;

a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.

11 Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị,

na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya,

sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee

fee nza iji kerie Jerusalem.

Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.

12 Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya

nʼụbọchị nsogbu ya,

ị garaghị aṅụ ndị Juda

nʼụbọchị ahụ e bibiri ha.

Ị garaghị anyara ha isi

nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu.

13 I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije

nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,

o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha,

nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,

maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha

nʼụbọchị nsogbu ha.

14 I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọ

igbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ,

maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha,

nʼụbọchị nsogbu ha.

15 "Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nso

nye mba niile.

Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị;

ihe i metara ga-adị gị nʼisi.

16 Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụ

otu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị.

Ha ga-aṅụ, ṅụọ,

ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ.

17 Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ,

ọ ga-adị nsọ,

ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.

18 Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ,

ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ:

ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka.

Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya.

Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ

site nʼụlọ Ịsọ."

Onyenwe anyị ekwuola ya.

19 Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi

nʼugwu ugwu Ịsọ,

ndị si na Shefela

ga-enwekọta ala ndị Filistia.

Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria.

Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.

20 Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala,

ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat.

Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad,

ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb.

21 Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn

maka ịchị ugwu Ịsọ niile.

Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.

Veja também

Publicidade
Obadias
Ver todos os capítulos de Obadias
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-