Publicidade

Amós 9

A ga-ebibi Izrel

1 Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị,

"Tie ọnụ ogidi ndị a ihe,

ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji.

Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile;

aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ.

Ọ dịghị onye ga-agbapụ,

ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya.

2 Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ,

site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha,

ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe,

site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.

3 Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel

nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha,

a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri,

nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.

4 Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ,

nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha.

"Aga m elekwasị ha anya m abụọ

nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma."

5 Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee,

ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ;

ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl,

nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.

6 Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,

na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.

Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,

ma na-awụsa ha nʼala,

aha ya bụ Onyenwe anyị.

7 "Ọ bụ na unu ndị Izrel

adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel,

site na Kafto kpọpụta ndị Filistia,

ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?

8 "Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị

nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.

Aghaghị m ịla ya nʼiyi,

kpochapụ ya site nʼelu ụwa,

naanị na m agaghị ebibicha

ụlọ Jekọb kpamkpam."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

9 "Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,

aga m ayọgharị ụlọ Izrel

nʼetiti mba niile

dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,

ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.

10 Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m,

ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị,

anyị agaghị ezute ya,

aghaghị ịnwụ site na mma agha.’

Nlọta ndị Izrel

11 "Nʼụbọchị ahụ,

"aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa.

Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji,

mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ.

Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.

12 Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm

tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m."

Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.

13 "Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,

"Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,

onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.

Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,

ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.

14 Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.

"Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha.

Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya.

Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.

15 Aga m akụ Izrel nʼala ha.

A gaghị ehopukwa ha ọzọ

site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha."

Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.

Veja também

Publicidade
Amós
Ver todos os capítulos de Amós
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-