Publicidade

Amós 2

1 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

"Nʼihi njehie atọ nke Moab,

e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.

Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ,

mee ha ka ha ghọọ ntụ.

2 Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab,

nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt.

Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara,

nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.

3 Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,

gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya."

Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.

4 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

"Nʼihi njehie atọ nke Juda,

e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.

Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị.

Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.

Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,

bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.

5 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,

ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem."

Ikpe ọmụma dịrị Izrel

6 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

"Nʼihi njehie atọ nke Izrel,

e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.

Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha,

reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.

7 Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị,

na-echi ha ọnụ nʼaja,

na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe.

Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ,

si otu a merụọ aha nsọ m.

8 Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla,

nʼelu uwe ndị anatara na mbe.

Nʼime ụlọnsọ chi ha,

ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.

9 "Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha,

ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida,

ndị sikwara ike dịka osisi ook.

Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu,

na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.

10 Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu,

duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ,

ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.

11 "Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,

họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.

Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.

12 "Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.

Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.

13 "Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,

dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.

14 Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ,

ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume,

ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.

15 Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla,

ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ.

Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.

16 Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu,

ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Veja também

Publicidade
Amós
Ver todos os capítulos de Amós
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-15_21-32-39-