Publicidade

Amós 8

Nkata mkpụrụ chara acha

1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara. 2 Ọ sịrị m, "Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?"

A sịrị m: "Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya."

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, "Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha."

3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, "Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!"

4 Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa,

na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,

5 na-asị,

"Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe

ka anyị ree mkpụrụ ubi,

na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ

ka anyị ree ọka wiiti?"

Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta,

na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu,

na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.

6 Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye,

jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa,

ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.

7 Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, "Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ."

8 Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a,

ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ?

Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl,

a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa

dịka iyi Ijipt.

9 "Ma nʼụbọchị ahụ," otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,

"Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie,

ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.

10 Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ;

gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa.

Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe,

meekwa ka unu kpụchaa isi unu.

Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ.

Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.

11 "Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa," otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,

"mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala,

ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri,

kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.

12 Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ,

sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ;

ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị,

ma ha agaghị achọta ya.

13 "Nʼụbọchị ahụ,

"ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike

ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.

14 Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi,

ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’

nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’

ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ."

Veja também

Publicidade
Amós
Ver todos os capítulos de Amós
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-16_18-40-07-