Publicidade

Casa de Deus

Por Bíblia Online

A casa de Deus é lugar de adoração, refúgio e encontro com o Sagrado. A Bíblia exalta o tabernáculo, o templo e a igreja como morada do Altíssimo entre seu povo.

A presença de Deus

Quão amáveis são os teus tabernáculos! Uma coisa pedi ao Senhor: habitar na casa do Senhor todos os dias da minha vida.

Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị,

karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ;

ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m,

karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.

Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,

nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;

ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị

ụbọchị niile nke ndụ m,

na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,

na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.

Ngọzị na-adịrị ndị ahụ họpụtara,

ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị!

E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị,

mee ka afọ ju anyị.

Ekpere maka udo Jerusalem

Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m,

"Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị."

Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m

ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,

m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị

mgbe niile ebighị ebi.

Ma adị m ka osisi oliv,

nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke,

nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.

Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,

ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.

O templo

Minha casa será chamada casa de oração. O zelo da tua casa me consumiu. O verdadeiro templo é o corpo do cristão.

Jisọs nʼụlọnsọ ukwu

Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru. sịrị ha, "E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere, ma unu emeela ya ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike."

Mmemme Ngabiga

Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem. Nʼime ụlọnsọ ukwu, hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego. Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu. sịrị ndị ahụ na-ere nduru, "Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka bụrụ ebe a na-azụ ahịa." Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, "Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi."

bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.

Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ.

Ma otu dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.

"Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis. Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid. Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi. Ma bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.

"Otu dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,

" Eluigwe bụ ocheeze m.

Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.

Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m?

Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị?

Ka Onyenwe anyị kwuru.

bụghị aka m mere ihe ndị a niile?

Ikpe ikpe na olileanya

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,

"Eluigwe bụ ocheeze m,

ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.

bụ ụdị ụlọ gịnị ka ga-ewuru m?

Ebee ka ebe izuike m ga-adị?"

bụghị aka m mere ihe ndị a niile,

mee ka ha ji dịrị?

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ,

bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu,

ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.

Jekọb tetara nʼụra sị, "Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya." tụrụ egwu sị, "Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe."

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-