Confiar no Senhor
Confiar no Senhor é a base de toda vida espiritual. A confiança em Deus nos livra do medo, nos dá paz e nos posiciona para receber as promessas divinas.
Confiar de todo coração
Confia no Senhor de todo o coração. Não te apoies em teu próprio entendimento — em todos os caminhos o reconheça.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Chineke onye na-echebe anyị
Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu
ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, "Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,
Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m."
Nʼezie, ọ ga-anapụta gị
site nʼọnya nke onye osi ọnya
na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.
Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị.
Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ,
ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.
Chineke onye na-echebe ndị ya
Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn
nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,
otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu
ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ;
obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi;
biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.
Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị;
tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:
Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ,
meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie.
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
Segurança em Deus
Bem-aventurado o homem que confia no Senhor. Ele é como árvore plantada junto às águas — não temerá quando vier o calor.
"Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ."
Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.
Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta."
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.
Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;
ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.
Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa,
ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị
karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.
Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị
karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
Não confiar no homem
Não temas — em ti confiarei. Melhor é confiar no Senhor do que confiar no homem ou nos príncipes.
Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya,
nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,
nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?
Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;
mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị.
Ekwuola m ya sị, "Naanị gị bụ Chineke m."
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;
onye na-adịghị ele ndị mpako anya
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
Jisọs akasịe ha obi
"Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.