Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 31

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Oge m dị gị nʼaka

1 Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;

ekwela ka ihere31:1 Ihere Maọbụ, ihe na-eweta ọnụma ma ọ bụkwanụ, ọnọdụ ịkwa emo mee m;

site nʼezi omume gị gbapụta m.

2 Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,

bịa ngwangwa gbapụta m;

ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,

ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.

3 Ebe bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,

nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.

4 Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m,

nʼihi na bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.

5 Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m;

gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.

6 Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru;

ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.

7 Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,

nʼihi na hụrụ nsogbu m

marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.

8 I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,

kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.

9 O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.

Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;

ike adịghịkwa m.

10 Iru ụjụ eriela m ahụ;

ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;

ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m

ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.

11 Nʼihi ndị iro m niile;

ndị agbataobi m na-elelị m anya.

Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m,

ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.

12 Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ.

A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.

13 Anụla m nkwulu ha megide m;

oke egwu dị nʼakụkụ niile;

ha na-agba izu megide m,

na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.

14 Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị.

Ekwuola m ya sị, "Naanị gị bụ Chineke m."

15 Oge m niile dị gị nʼaka.

Napụta m nʼaka ndị iro m

na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.

16 Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ;

zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.

17 O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m,

nʼihi na akpọkuola m gị;

kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ,

ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu.

18 Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam;

nʼihi na bụ site na mpako na nlelị

ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.

19 Lee ka ịdị mma gị si baa ụba,

nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị,

nke na-enye ndị na-agbaba nʼime gị,

nʼihu ọha mmadụ.

20 I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị

pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ;

na-echebe ha nʼime ebe obibi gị;

ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.

21 Otuto dịrị Onyenwe anyị

nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu

mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.

22 Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị,

"Ewezugala m site nʼihu ya!"

Ma nụrụ arịrịọ m maka ebere

mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.

23 Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi,

nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya,

ma na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.

24 Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,

unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.

Veja também