Publicidade

Coração quebrantado

Por Bíblia Online

Deus está perto dos que têm o coração quebrantado. A Bíblia consola os aflitos: o sacrifício que Deus aceita é o espírito quebrantado e um coração contrito — jamais desprezará.

Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,

na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.

Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa,

O Chineke, naghị elefu anya,

nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.

na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa

na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.

Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,

ma Chineke bụ ike nke obi m,

na ihe nketa m ruo ebighị ebi.

Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka dị ukwuu,

onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru:

"Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ,

ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala,

itute mmụọ nke onye e wedara nʼala,

na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.

bụghị aka m mere ihe ndị a niile,

mee ka ha ji dịrị?

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ,

bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu,

ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.

Afọ ngosi ihuọma Onyenwe anyị

Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m,

nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ

ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.

O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi,

ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha,

na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.

O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ,

na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị.

O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi,

na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha.

O zitere m inye ha okpueze mara mma

nʼọnọdụ ntụ,

inye ha ọṅụ,

nʼọnọdụ ịkwa akwa,

na iyikwasị ha mmụọ otuto

nʼọnọdụ mmụọ ịda mba.

Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha,

dịka osisi ook siri ike,

igosi ịma mma Onyenwe anyị.

"Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ,

nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.

Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ,

nʼihi na a ga-akasị ha obi.

Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi,

nʼihi na ha ga-eketa ụwa.

Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ. Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile.

Ma sịrị m, "Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike." Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-04_21-26-40-