Crianças
As crianças ocupam lugar especial no coração de Deus. A Bíblia instrui a educá-las, protegê-las e ensiná-las nos caminhos do Senhor desde cedo — formando gerações que temem a Deus.
Herança do Senhor
Os filhos são herança do Senhor. Eles são presentes de Deus — cada criança é um milagre e uma responsabilidade sagrada.
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,
ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,
ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị
e ji achọ ụlọeze mma.
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma.
Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?
Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?
Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
Ụmụ m, bịanụ gee m ntị;
aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
Instruir as crianças
Instrui a criança no caminho em que deve andar. A educação cristã é mandamento repetido através de toda a Escritura.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,
ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche,
ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;
ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya
ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.
Ma debe iwu m nʼobi gị.
Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ,
wetakwara gị udo na ọganihu.
Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.
Ma debe iwu m nʼobi gị.
Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,
dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
ọ ziri m ihe, sịkwa m,
"Ka obi gị jidesie okwu m niile ike,
debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,
echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
Disciplinar com amor
A vara e a repreensão dão sabedoria. A disciplina produz o fruto pacífico da justiça nos que são exercitados por ela.
Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,
ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị.
Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị,
akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
Zụta eziokwu, erekwala ya,
zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi
karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke,
ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.
Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile,
nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute,
bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;
ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.
Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,
ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.
Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,
ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
"Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;
nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.
Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,
agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.
Obediência e promessa
Filhos, obedecei a vossos pais no Senhor. Honra a teu pai e tua mãe para que viva muito tempo sobre a terra.
Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. "Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya.
Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi. Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.
Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.
ọ gwara ha okwu ndị a sị, "Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a. Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan."
Crianças e o reino
Deixai vir a mim as crianças. Jesus honrou as crianças como modelo de fé e humildade para todo o seu povo.
Ma Jisọs sịrị ha, "Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a."
Ma Jisọs sịrị ha, "Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a."
Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, "Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?"
Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, ọ sịrị, "Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
ọ sịrị, "Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe. Onye ọbụla nabatara nwantakịrị dị otu a nʼihi m, bụ onye nabatara m.
"Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile.
Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, "Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.
Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya,
nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.
Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba. Ma mgbe Jisọs hụrụ nke a, iwe were ya nke ukwuu, ọ sịrị ha, "Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.
Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha, "Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m."
Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.
Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, "Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?"
Ọ sịrị ya, "E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya."
Jisọs sịrị ya, "Na-azụ ụmụ atụrụ m."
Identidade e crescimento
Somos filhos de Deus pelo Espírito de adoção. Crescer em Cristo é amadurecer em fé, obediência e amor ao próximo.
Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.
Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke.
Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ "Abba, Nna."
Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke.
Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke.
Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs. Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.
Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.
Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị. Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.
Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m
nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya.
Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.
Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla.
Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.
Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ,
"Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ
maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.
Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba.
Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị."
Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.
Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.
Ha sịrị, "Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile."
Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.
Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a.
Transmitir a fé
Contaremos à geração vindoura os louvores do Senhor. O legado de fé é o maior presente que damos aos nossos filhos.
Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.
Udo ha ga-adịkwa ukwu.
Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.
Udo ha ga-adịkwa ukwu.
Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,
dị ka m na-eme taa.
Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso ha
mata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.
"Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu.
Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, "Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha."
Nwata ahụ bụ Samuel nọkwa na-ejere Onyenwe anyị ozi nʼihu Elayị. Nʼụbọchị ndị ahụ okwu Onyenwe anyị dị ụkọ, adịghịkwa ahụ ọtụtụ ọhụ.
O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.
O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.
Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,
mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel,
bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị,
ka ha kuziere ụmụ ha,
ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,
ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị,
ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,
ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche.
Ha ga-edebekwa iwu ya niile.