Desejos
Os desejos revelam o que há no coração. A Bíblia nos ensina a purificar nossos desejos, submeter a carne ao espírito e buscar as coisas que são de cima.
Desejos da carne
A carne milita contra o espírito. O cristão é chamado a vigiar, resistir e não satisfazer os desejos da natureza pecaminosa.
Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.
Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo.
Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike."
Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa,
kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’
Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi.
Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).
Purificar os desejos
Guarda o teu coração. Das profundezas do interior do homem saem os desejos — bons ou maus, conforme o coração.
"Mụ na anya m gbara ndụ kpebie
na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.
Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ
ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa,
ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.
Nʼihi na akụ nwere ike ifu
nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị
na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.
Ị na-asị, "Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime," ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. "Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi," ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m.
Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.
O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.
Desejos santos
Como a corça deseja as correntes de água, minha alma suspira por ti, ó Deus. Os desejos do Espírito produzem vida e paz.
Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,
otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.
E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,
na-ele anya gị.
Aha gị na ihe niile e ji mara gị
bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.
O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.
Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere.
Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, "Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a." Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ.
Ugbu a, gịnị ka anyị ga-ekwu? Iwu ahụ ọ bụ mmehie? Nʼezie, mbaa! Agaraghị m ama ihe mmehie bụ ma ọ bụghị site nʼiwu. Ọ bụrụ na iwu asịghị, "Enwela anya ukwu," agaraghị m ama na ọ bụ mmehie.
Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.