Publicidade

Jó 31

1 "Mụ na anya m gbara ndụ kpebie

na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.31:1 Maọbụ, anya ọjọọ Mat 5:28

2 Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;

gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?

3 bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,

nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?

4 bụ na naghị ahụ ụzọ m niile,

gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?

5 "bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha

maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,

6 ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,

ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.

7 bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,

bụrụ anya m na-edu obi m,

ma bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,

8 bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,

ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.

9 "bụrụ na gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,

maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,

10 mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,

ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.

11 Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,

bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.

12 bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;31:12 Maọbụ, Mbibi

nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.

13 "bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi

nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi

mgbe ha nwere mkpesa megide m,

14 gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?

Gịnị ka m ga-aza ya mgbe jụrụ m ajụjụ?

15 bụ na bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?

bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?

16 "bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,

ma bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,

17 bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,

ma jụ inye ya ụmụ mgbei;

18 ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,

bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.

19 bụrụ na dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,

maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,

20 ma obi ha agọzighị m

nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.

21 bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,

nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,

22 mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,

ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.

23 Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,

nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.

24 "bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,

maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, bụ ebe ndabere m.

25 bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,

ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,

26 bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,

maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,

27 nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,

maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,

28 mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,

nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.

29 "bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m

maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,

30 ekwebeghị m ka ọnụ m mehie

megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.

31 bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.

Onye ka bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?

32 Ma dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,

nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.

33 bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,31:33 Maọbụ, dịka Adam mere

site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,

34 nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,

si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,

nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.

35 ("O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!

Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,

ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.

36 Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,

aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.

37 Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,

aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)

38 "bụrụ na ala m etie mkpu megide m,

bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,

39 bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,

maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,

40 ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,

ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị."

Okwu Job agwụla.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-