Publicidade

Dificuldades

Por Bíblia Online

As dificuldades são parte da vida, mas Deus é refúgio certo em todo tempo de angústia. A Bíblia promete que nenhuma adversidade pode separar os filhos de Deus do seu amor.

Deus é refúgio

Deus é nosso refúgio e fortaleza, socorro bem presente nas angústias. Nada poderá nos separar do amor de Cristo.

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka bụ nʼoge nsogbu.

Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,

maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.

Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,

maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela

Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, "bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,

Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m."

Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;

kwupụtaranụ ya obi unu,

nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela

Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.

bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.

Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,

nʼihi na dịghị mgbe na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.

na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;

mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.

Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu

karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme,

ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.

O mere ka oke ifufe dere duu;

o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.

Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? bụ nsogbu, ka bụ ihe isi ike, ka bụ mkpagbu. Ka bụ ụnwụ, ka bụ ịgba ọtọ, ka bụ ihe egwu, ka bụ mma agha? Dịka e dere ya,

"bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile.

A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu."

Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

Provisão nas dificuldades

O Senhor provê mesmo nos tempos mais difíceis. Ele sustentou Elias, protegeu Israel e cuida dos seus com fidelidade eterna.

Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.

gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi,

na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.

Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel,

jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.

O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara;

sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.

Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,

ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,

maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.

Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị,

ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ;

ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.

Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,

mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.

Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,

meekwa ka ngọzị m dịrị ha.

Nʼihi na bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba;

bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha,

ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo,

na ndo nʼoge okpomọkụ.

Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere

dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,

ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri.

Mgbe si na mmiri dị omimi na-agafe,

aga m anọnyere gị.

Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,

agaghị m ekwe ka o bufuo gị.

Mgbe na-eje ije nʼime ọkụ,

gaghị eregbu gị.

Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.

Força nas provas

Em tudo somos atribulados, mas não esmagados. O Senhor é bom e é fortaleza no dia da angústia — Ele conhce os seus.

A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi.

Onyenwe anyị dị mma.

bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.

na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,

na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,

ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.

na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,

na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,

O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,

ka bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.

ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.

gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.

Ma zaghachiri, "Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?" Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.

O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, "bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru."

Ma bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, bụ na gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta? Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, Gịnị ka anyị ga-eri?maọbụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ?maọbụ, Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?

Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).

Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-