Dificuldades
As dificuldades são parte da vida, mas Deus é refúgio certo em todo tempo de angústia. A Bíblia promete que nenhuma adversidade pode separar os filhos de Deus do seu amor.
Deus é refúgio
Deus é nosso refúgio e fortaleza, socorro bem presente nas angústias. Nada poderá nos separar do amor de Cristo.
Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela
Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, "Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,
Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m."
Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;
kwupụtaranụ ya obi unu,
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela
Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;
mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu
karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme,
ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.
O mere ka oke ifufe dere duu;
o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha? Dịka e dere ya,
"Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile.
A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu."
Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Provisão nas dificuldades
O Senhor provê mesmo nos tempos mais difíceis. Ele sustentou Elias, protegeu Israel e cuida dos seus com fidelidade eterna.
Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.
Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi,
na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel,
jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara;
ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.
Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,
ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,
maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị,
ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ;
ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.
Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,
mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.
Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,
meekwa ka ngọzị m dịrị ha.
Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba;
ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha,
ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo,
na ndo nʼoge okpomọkụ.
Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere
dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,
Ọ ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. Ọ ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri.
Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
aga m anọnyere gị.
Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,
agaghị m ekwe ka o bufuo gị.
Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,
ọ gaghị eregbu gị.
Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.
Força nas provas
Em tudo somos atribulados, mas não esmagados. O Senhor é bom e é fortaleza no dia da angústia — Ele conhce os seus.
A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi.
Onyenwe anyị dị mma.
Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.
Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,
ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,
na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,
ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.
Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara.
Ma ọ zaghachiri, "Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?" Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.
O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, "Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru."
Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta? Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’
Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).
Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ.