Publicidade

Jó 26

Okwu Job

1 Mgbe ahụ, Job zaghachiri:

2 "Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!

Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!

3 Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!

Leekwa ụdị oke nghọta nke gosipụtara.

4 bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?

Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?

5 "Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,

ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.

6 Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;

mbibi26:6 Maọbụ, Abadọn nʼasụsụ Hibru tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya.

7 na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.

O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.

8 na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,

ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.

9 na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,26:9 Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze nke ọnwa

na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,

10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,

ka bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.

11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,

tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.

12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;

bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.

13 bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;

aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.

14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;26:14 Ihe ndị a bụ ụfọdụ nʼime ihe ọ na-eme

lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya!

Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda26:14 Egbe eluigwe nke ike nke ike ya?"

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-