Dinheiro
O dinheiro é ferramenta que pode ser usada para o bem ou para o mal. A Bíblia nos ensina a administrar recursos com sabedoria, generosidade e temor ao Senhor.
Perspectiva bíblica
Guardai-vos da avareza. A vida não consiste na abundância de bens. O dinheiro é servo, nunca senhor.
Ma ọ sịrị ha, "Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere."
Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
"Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
Nʼihi na akụ nwere ike ifu
nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị
na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya,
atụkwasịla obi na nghọta gị.
Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ.
Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.
Nke a bụkwa ihe efu.
Administrar com sabedoria
Honra ao Senhor com as tuas primícias. O sábio administra seus recursos com prudência e visão de eternidade.
Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị,
na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,
ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,
ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;
ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.
Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe
karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,
ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.
Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,
karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.
Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.
Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ.
Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya,
kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
Perigos e armadilhas
Quem quer enriquecer cai em tentação. Fuja do amor ao dinheiro e busque contentamento no Senhor.
Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi.
Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ.
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola,
"Agaghị m ahapụ gị.
O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ."
Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;
ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
Tudo vem de Deus
De ti vem tudo, e das tuas mãos to damos. Os tributos são devidos — dai a César o que é de César e a Deus o que é de Deus.
"Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.
Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị.
Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere
dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume;
nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume,
ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.
Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile
dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.