Encorajamento
O encorajamento é uma das vocações mais lindas do cristão. A Bíblia transborda de palavras de ânimo: não temas, levanta-te, Eu sou contigo. Deus nos encoraja para encorajarmos outros.
Não temas
Deus diz repetidamente: não temas, Eu sou contigo. Ele fortalece, sustenta e caminha ao nosso lado em cada desafio.
Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
aga m anọnyere gị.
Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,
agaghị m ekwe ka o bufuo gị.
Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,
ọ gaghị eregbu gị.
Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.
Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
ebe ọ bụkwa na m hụrụ gị nʼanya,
aga m ewere ndị mmadụ nye nʼihi ịgbapụta gị.
Aga m ebibi ndụ ndị mmadụ nʼihi ichebe gị ndụ.
Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.
Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ
na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị.
"Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ.
Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala.
Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị,
na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
"Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.
Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.
Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,
asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, "Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?"
Asịrị m, "Lee m, ziga m."
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga."
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga."
Ndị Izrel niile zara sị ya, "O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ! Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.
Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu."
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba."
Deus está conosco
Se Deus é por nós, quem será contra nós? Tudo posso naquele que me fortalece. Ele nos encoraja pela sua presença.
Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?
Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ "Abba, Nna."
Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu.
Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere.
Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe. Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.
Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.
Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu.
Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.
Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu. Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ihe dị mmadụ nʼobi. Ọ bụrụ na anyị amaghị onwe anyị, ọ bụ nʼihi Chineke, ọ bụrụ na anyị nwere uche zuruoke, ọ bụ nʼihi unu. Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla. Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie.
Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie. Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo. Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ. Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo. Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.
Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.
Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke.
Ânimo nas lutas
No mundo tereis aflições, mas tende bom ânimo — Eu venci o mundo. O Senhor é refúgio seguro em toda tribulação.
"Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa."
"Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa."
Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.
Promessas de conforto
Vinde a mim os cansados e sobrecarregados. Lança sobre Ele tuas ansiedades, pois Ele cuida de ti.
"Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.
Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
ọ ga-agba gị ume;
ọ gaghị ekwe
ka ewezuga onye ezi omume.
A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.
A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.
Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,
unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.
Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela
Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.
Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,
nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.
Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?
Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị;
mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike,
e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.
Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,
olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,
onye kere eluigwe na ụwa bịa.
Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.
Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe? Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. "Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri."
Encorajar uns aos outros
Encorajai-vos mutuamente e edificai-vos uns aos outros. Não desanimemos — a bondade do Senhor é nova a cada manhã.
Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ. Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola,
"Agaghị m ahapụ gị.
O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ."
Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo,
"Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?"
Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.
Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, "Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.
Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ."
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru;
ma oke okwu na-eweta ụkpa.
Jisọs siri ha, "Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ." Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya.
Deus chama pelo nome
Ao longo da Bíblia, Deus chamou seus servos pelo nome — Abraão, Moisés, Samuel, Paulo — encorajando cada um pessoalmente.
Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, "Jekọb! Jekọb!"
Ọ zara sị, "Lee m nʼebe a."
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’
Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, "Ebraham! Ebraham!"
Ebraham zara, "Lekwa m nʼebe a."
Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, "Mosis! Mosis!"
Ọ sị, "Lekwa m nʼebe a."
Ma Elayị kpọrọ ya sị, "Samuel, nwa m."
Samuel zara sị, "Lee m nʼebe a."
Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ, "Ananayas!"
Ọ sịrị, "Lee m, Onyenwe anyị."
Meri zaghachiri sị, "Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru." Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru. Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.